Native Bible

Psalms 42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 42
1Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. 2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri nʼehihie ma nʼabalị, mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, “Olee ebe Chineke gị nọ?” 4Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m. 6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza. 7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m. 8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya, nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, ekpere nye Chineke nke ndụ m. 9Ana m asị Chineke, oke nkume m, “Gịnị mere i ji chefuo m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ nʼihi mmegbu nke onye iro?” 10Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, “Olee ebe Chineke gị nọ?” 11O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, Onye nzọpụta m na Chineke m. 42:6 Hemon bụ obodo dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.