Abụ Ọma 42
Psalms 42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,
otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. 2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.
Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri
nʼehihie ma nʼabalị,
mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,
“Olee ebe Chineke gị nọ?” 4Ihe ndị a ka m na-echeta
mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:
ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,
mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha
nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,
na-aga nʼụlọ Chineke. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya,
Onye nzọpụta m na Chineke m. 6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;
ya mere, aga m echeta gị
site nʼala Jọdan,
na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza. 7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri
mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;
ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile
ekpuchiela isi m. 8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,
nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,
ekpere nye Chineke nke ndụ m. 9Ana m asị Chineke, oke nkume m,
“Gịnị mere i ji chefuo m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ
nʼihi mmegbu nke onye iro?” 10Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu,
mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị,
ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m,
“Olee ebe Chineke gị nọ?” 11O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
Onye nzọpụta m na Chineke m.
42:6 Hemon bụ obodo dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.