Native Bible

Psalms 42:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza.

Psalms 42:6 in English

Psalms 42:6 · Berean Standard Bible

O my God, my soul despairs within me. Therefore I remember You from the land of Jordan and the peaks of Hermon— even from Mount Mizar.

Context

4Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m. 6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza. 7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m. 8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya, nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, ekpere nye Chineke nke ndụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.