Abụ Ọma 42:6
Psalms 42:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza.
Psalms 42:6 in English
Psalms 42:6 · Berean Standard Bible
O my God, my soul despairs within me. Therefore I remember You from the land of Jordan and the peaks of Hermon— even from Mount Mizar.
Context
4Ihe ndị a ka m na-echeta
mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:
ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,
mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha
nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,
na-aga nʼụlọ Chineke. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya,
Onye nzọpụta m na Chineke m. 6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;
ya mere, aga m echeta gị
site nʼala Jọdan,
na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza. 7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri
mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;
ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile
ekpuchiela isi m. 8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,
nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,
ekpere nye Chineke nke ndụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.