Native Bible

Psalms 42:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m.

Psalms 42:5 in English

Psalms 42:5 · Berean Standard Bible

Why are you downcast, O my soul? Why the unease within me? Put your hope in God, for I will yet praise Him for the salvation of His presence.

Context

3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri nʼehihie ma nʼabalị, mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, “Olee ebe Chineke gị nọ?” 4Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m. 6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza. 7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.