Abụ Ọma 42:5
Psalms 42:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m.
Psalms 42:5 in English
Psalms 42:5 · Berean Standard Bible
Why are you downcast, O my soul? Why the unease within me? Put your hope in God, for I will yet praise Him for the salvation of His presence.
Context
3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri
nʼehihie ma nʼabalị,
mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,
“Olee ebe Chineke gị nọ?” 4Ihe ndị a ka m na-echeta
mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:
ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,
mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha
nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,
na-aga nʼụlọ Chineke. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya,
Onye nzọpụta m na Chineke m. 6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;
ya mere, aga m echeta gị
site nʼala Jọdan,
na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza. 7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri
mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;
ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile
ekpuchiela isi m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.