Abụ Ọma 42:7
Psalms 42:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m.
Psalms 42:7 in English
Psalms 42:7 · Berean Standard Bible
Deep calls to deep in the roar of Your waterfalls; all Your breakers and waves have rolled over me.
Context
5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya,
Onye nzọpụta m na Chineke m. 6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;
ya mere, aga m echeta gị
site nʼala Jọdan,
na ebe dị elu nke Hemon,* na sitekwa nʼugwu Miza. 7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri
mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;
ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile
ekpuchiela isi m. 8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,
nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,
ekpere nye Chineke nke ndụ m. 9Ana m asị Chineke, oke nkume m,
“Gịnị mere i ji chefuo m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ
nʼihi mmegbu nke onye iro?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.