Abụ Ọma 41
Psalms 41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye;
Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu. 2Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ;
ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ,
ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha. 3Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike,
meekwa ka ahụ dị ha mma. 4Ekwuru m sị, “O Onyenwe anyị, meere m ebere;
gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.” 5Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m
na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?” 6Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m,
ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu;
mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya. 7Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m;
ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha: 8“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya;
ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.” 9Ọ bụladị ezigbo enyi m,
onye m tụkwasịrị obi,
onye mụ na ya na-eso erikọ nri m,
ebiliela imegide m. 10Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere,
mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ. 11Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi,
nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ. 12Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m,
mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. 13Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Amen na Amen.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.