Abụ Ọma 41:7
Psalms 41:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:
Psalms 41:7 in English
Psalms 41:7 · Berean Standard Bible
All who hate me whisper against me; they imagine the worst for me:
Context
5Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m
na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?” 6Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m,
ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu;
mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya. 7Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m;
ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha: 8“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya;
ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.” 9Ọ bụladị ezigbo enyi m,
onye m tụkwasịrị obi,
onye mụ na ya na-eso erikọ nri m,
ebiliela imegide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.