Native Bible

Psalms 41:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:

Psalms 41:7 in English

Psalms 41:7 · Berean Standard Bible

All who hate me whisper against me; they imagine the worst for me:

Context

5Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?” 6Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m, ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu; mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya. 7Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha: 8“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.” 9Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.