Native Bible

Psalms 41:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere, mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.

Psalms 41:10 in English

Psalms 41:10 · Berean Standard Bible

But You, O LORD, be gracious to me and raise me up, that I may repay them.

Context

8“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.” 9Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m. 10Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere, mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ. 11Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi, nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ. 12Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m, mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.