Abụ Ọma 42:2
Psalms 42:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?
Psalms 42:2 in English
Psalms 42:2 · Berean Standard Bible
My soul thirsts for God, the living God. When shall I come and appear in God’s presence?*
Context
1Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,
otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. 2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.
Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri
nʼehihie ma nʼabalị,
mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,
“Olee ebe Chineke gị nọ?” 4Ihe ndị a ka m na-echeta
mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:
ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,
mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha
nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,
na-aga nʼụlọ Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.