Abụ Ọma 42:10
Psalms 42:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, “Olee ebe Chineke gị nọ?”
Psalms 42:10 in English
Psalms 42:10 · Berean Standard Bible
Like the crushing of my bones, my enemies taunt me, while they say to me all day long, “Where is your God?”
Context
8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,
nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,
ekpere nye Chineke nke ndụ m. 9Ana m asị Chineke, oke nkume m,
“Gịnị mere i ji chefuo m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ
nʼihi mmegbu nke onye iro?” 10Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu,
mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị,
ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m,
“Olee ebe Chineke gị nọ?” 11O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
Onye nzọpụta m na Chineke m.
42:6 Hemon bụ obodo dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.