Abụ Ọma 108
Psalms 108 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Obi m dị njikere, o Chineke;
aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu. 2Teta! Ụbọ akwara na une!
Aga m akpọte chi ọbụbọ. 3Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile;
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 4Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 5Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile,
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. 6Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 7Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya. 8Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m;
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m. 9Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 10Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm? 11Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị,
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha? 12Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu. 13Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.