Abụ Ọma 108:6
Psalms 108:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
Psalms 108:6 in English
Psalms 108:6 · Berean Standard Bible
Respond and save us with Your right hand, that Your beloved may be delivered.
Context
4Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 5Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile,
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. 6Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 7Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya. 8Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m;
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.