Abụ Ọma 108:8
Psalms 108:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
Psalms 108:8 in English
Psalms 108:8 · Berean Standard Bible
Gilead is Mine, and Manasseh is Mine; Ephraim is My helmet, Judah is My scepter.
Context
6Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 7Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya. 8Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m;
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m. 9Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 10Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.