Native Bible

Psalms 108:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.

Psalms 108:3 in English

Psalms 108:3 · Berean Standard Bible

I will praise You, O LORD, among the nations; I will sing Your praises among the peoples.

Context

1Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu. 2Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ. 3Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 4Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 5Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.