Native Bible

Psalms 105:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.

Psalms 105:23 in English

Psalms 105:23 · Berean Standard Bible

Then Israel entered Egypt; Jacob dwelt in the land of Ham.

Context

21O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere, 22ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe. 23Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa. 24Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha, 25ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.