Native Bible

Psalms 105:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.

Psalms 105:25 in English

Psalms 105:25 · Berean Standard Bible

whose hearts He turned to hate His people, to conspire against His servants.

Context

23Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa. 24Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha, 25ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya. 26O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara. 27Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.