Native Bible

Psalms 105:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.

Psalms 105:26 in English

Psalms 105:26 · Berean Standard Bible

He sent Moses His servant, and Aaron, whom He had chosen.

Context

24Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha, 25ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya. 26O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara. 27Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham. 28O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.