Nehum 3:6
Nahum 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche, meso gị mmeso onye e ledara anya, mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile.
Nahum 3:6 in English
Nahum 3:6 · Berean Standard Bible
I will pelt you with filth and treat you with contempt; I will make a spectacle of you.
Context
4Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko,
onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche,
onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya,
na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya. 5“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu,
si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị.
Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile. 6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche,
meso gị mmeso onye e ledara anya,
mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile. 7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị,
‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’
Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?” 8Ị dị mma karịa Tibs,
bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl,
nke mmiri gbara gburugburu?
Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya,
mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.