Native Bible

Nahum 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile.

Nahum 3:5 in English

Nahum 3:5 · Berean Standard Bible

“Behold, I am against you,” declares the LORD of Hosts. “I will lift your skirts over your face. I will show your nakedness to the nations and your shame to the kingdoms.

Context

3Ndị agha ịnyịnya, na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma, na ùbe ha na-egbuke egbuke. Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ, ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile, ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe. 4Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko, onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche, onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya, na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya. 5“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile. 6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche, meso gị mmeso onye e ledara anya, mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile. 7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.