Native Bible

Nahum 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”

Nahum 3:7 in English

Nahum 3:7 · Berean Standard Bible

Then all who see you will recoil from you and say, ‘Nineveh is devastated; who will grieve for her?’ Where can I find comforters for you?”

Context

5“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile. 6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche, meso gị mmeso onye e ledara anya, mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile. 7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?” 8Ị dị mma karịa Tibs, bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl, nke mmiri gbara gburugburu? Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya, mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu. 9Kush* na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.