Nehum 3:7
Nahum 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”
Nahum 3:7 in English
Nahum 3:7 · Berean Standard Bible
Then all who see you will recoil from you and say, ‘Nineveh is devastated; who will grieve for her?’ Where can I find comforters for you?”
Context
5“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu,
si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị.
Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile. 6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche,
meso gị mmeso onye e ledara anya,
mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile. 7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị,
‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’
Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?” 8Ị dị mma karịa Tibs,
bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl,
nke mmiri gbara gburugburu?
Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya,
mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu. 9Kush* na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ,
Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.