Nehum 3:9
Nahum 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kush* na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.
Nahum 3:9 in English
Nahum 3:9 · Berean Standard Bible
Cush * and Egypt were her boundless strength; Put and Libya were her allies.
Context
7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị,
‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’
Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?” 8Ị dị mma karịa Tibs,
bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl,
nke mmiri gbara gburugburu?
Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya,
mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu. 9Kush* na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ,
Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya. 10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ
dịka ohu a dọtara nʼagha.
A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume,
nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile.
E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ,
e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe. 11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,*
ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo,
ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.