Nehum 3:8
Nahum 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị dị mma karịa Tibs, bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl, nke mmiri gbara gburugburu? Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya, mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
Nahum 3:8 in English
Nahum 3:8 · Berean Standard Bible
Are you better than Thebes,* stationed by the Nile with water around her, whose rampart was the sea, whose wall was the water?
Context
6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche,
meso gị mmeso onye e ledara anya,
mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile. 7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị,
‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’
Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?” 8Ị dị mma karịa Tibs,
bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl,
nke mmiri gbara gburugburu?
Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya,
mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu. 9Kush* na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ,
Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya. 10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ
dịka ohu a dọtara nʼagha.
A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume,
nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile.
E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ,
e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.