Nehum 3:11
Nahum 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,* ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.
Nahum 3:11 in English
Nahum 3:11 · Berean Standard Bible
You too will become drunk; you will go into hiding and seek refuge from the enemy.
Context
9Kush* na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ,
Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya. 10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ
dịka ohu a dọtara nʼagha.
A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume,
nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile.
E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ,
e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe. 11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,*
ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo,
ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị. 12Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig
nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya.
Ma mgbe a kwagharịrị ya
mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya. 13Lee ndị agha gị,
ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị.
E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile
nye ndị iro gị.
Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.