Native Bible

Nahum 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,* ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.

Nahum 3:11 in English

Nahum 3:11 · Berean Standard Bible

You too will become drunk; you will go into hiding and seek refuge from the enemy.

Context

9Kush* na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya. 10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ dịka ohu a dọtara nʼagha. A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume, nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile. E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ, e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe. 11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,* ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị. 12Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya. 13Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.