Nehum 3:12
Nahum 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya.
Nahum 3:12 in English
Nahum 3:12 · Berean Standard Bible
All your fortresses are fig trees with the first ripe figs; when shaken, they fall into the mouth of the eater!
Context
10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ
dịka ohu a dọtara nʼagha.
A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume,
nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile.
E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ,
e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe. 11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,*
ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo,
ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị. 12Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig
nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya.
Ma mgbe a kwagharịrị ya
mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya. 13Lee ndị agha gị,
ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị.
E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile
nye ndị iro gị.
Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile. 14Seta mmiri maka oge nnọchibido,
mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa.
Gwupụta ụrọ,
zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ
kpụtakwa aja,* rụzikwaa ụlọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.