Native Bible

Nahum 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Seta mmiri maka oge nnọchibido, mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa. Gwupụta ụrọ, zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ kpụtakwa aja,* rụzikwaa ụlọ ahụ.

Nahum 3:14 in English

Nahum 3:14 · Berean Standard Bible

Draw your water for the siege; strengthen your fortresses. Work the clay and tread the mortar; repair the brick kiln!

Context

12Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya. 13Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile. 14Seta mmiri maka oge nnọchibido, mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa. Gwupụta ụrọ, zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ kpụtakwa aja,* rụzikwaa ụlọ ahụ. 15Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị, mma agha ga-egbutu gị. Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu. Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana, maọbụ mụbaa dịka igurube. 16Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.