Native Bible

Nahum 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga

Nahum 3:16 in English

Nahum 3:16 · Berean Standard Bible

You have multiplied your merchants more than the stars of the sky. The young locust strips the land and flies away.

Context

14Seta mmiri maka oge nnọchibido, mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa. Gwupụta ụrọ, zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ kpụtakwa aja,* rụzikwaa ụlọ ahụ. 15Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị, mma agha ga-egbutu gị. Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu. Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana, maọbụ mụbaa dịka igurube. 16Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga 17Ndị nche gị bara ụba igurube, ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga; ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa. 18Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ* gị na-ero ụra, ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ. Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile, ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.