Native Bible

Nahum 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ* gị na-ero ụra, ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ. Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile, ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha.

Nahum 3:18 in English

Nahum 3:18 · Berean Standard Bible

O king of Assyria, your shepherds slumber; your officers sleep. Your people are scattered on the mountains with no one to gather them.

Context

16Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga 17Ndị nche gị bara ụba igurube, ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga; ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa. 18Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ* gị na-ero ụra, ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ. Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile, ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha. 19Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa. Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị. Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gị ga-eji ọṅụ kụọ aka ha, nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụ nke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị? 3:9 Ya bụ, Itiopia 3:11 Ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu 3:14 Lit. Blọk brik 3:18 Maọbụ, ndị ndu

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.