Nehum 3:17
Nahum 3:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nche gị bara ụba igurube, ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga; ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa.
Nahum 3:17 in English
Nahum 3:17 · Berean Standard Bible
Your guards * are like the swarming locust, and your scribes * like clouds of locusts that settle on the walls on a cold day. When the sun rises, they fly away, and no one knows where.
Context
15Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị,
mma agha ga-egbutu gị.
Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu.
Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana,
maọbụ mụbaa dịka igurube. 16Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ,
baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe,
dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ,
gbasaa nku ha efelaga 17Ndị nche gị bara ụba igurube,
ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube
na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi.
Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga;
ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa. 18Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ* gị na-ero ụra,
ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ.
Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile,
ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha. 19Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa.
Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị.
Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gị
ga-eji ọṅụ kụọ aka ha,
nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụ
nke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị?
3:9 Ya bụ, Itiopia
3:11 Ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu
3:14 Lit. Blọk brik
3:18 Maọbụ, ndị ndu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.