Native Bible

Nahum 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.

Nahum 3:13 in English

Nahum 3:13 · Berean Standard Bible

Look at your troops— they are like your women! The gates of your land are wide open to your enemies; fire consumes their bars.

Context

11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,* ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị. 12Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya. 13Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile. 14Seta mmiri maka oge nnọchibido, mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa. Gwupụta ụrọ, zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ kpụtakwa aja,* rụzikwaa ụlọ ahụ. 15Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị, mma agha ga-egbutu gị. Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu. Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana, maọbụ mụbaa dịka igurube.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.