Nehum 3:4
Nahum 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko, onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche, onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya, na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya.
Nahum 3:4 in English
Nahum 3:4 · Berean Standard Bible
because of the many harlotries of the harlot, the seductive mistress of sorcery, who betrays nations by her prostitution and clans by her witchcraft.
Context
2Ụda ụtarị,
ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya,
ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ,
na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha! 3Ndị agha ịnyịnya,
na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma,
na ùbe ha na-egbuke egbuke.
Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ,
ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile,
ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ,
ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe. 4Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko,
onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche,
onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya,
na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya. 5“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu,
si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị.
Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile. 6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche,
meso gị mmeso onye e ledara anya,
mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.