Native Bible

Nahum 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụda ụtarị, ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya, ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ, na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha!

Nahum 3:2 in English

Nahum 3:2 · Berean Standard Bible

The crack of the whip, the rumble of the wheel, galloping horse and bounding chariot!

Context

1Ahụhụ dịrị obodo ọbara, nke jupụtara nʼụgha, na ihe e zutere nʼohi. Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu. 2Ụda ụtarị, ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya, ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ, na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha! 3Ndị agha ịnyịnya, na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma, na ùbe ha na-egbuke egbuke. Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ, ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile, ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe. 4Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko, onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche, onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya, na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.