Abụ Akwa 1:10
Lamentations 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye iro agbasaala aka ya chịkọtaa akụ ya niile. O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche si bata ebe nsọ ya. Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.
Lamentations 1:10 in English
Lamentations 1:10 · Berean Standard Bible
The adversary has seized all her treasures. For she has seen the nations enter her sanctuary— those You had forbidden to enter Your assembly.
Context
8Jerusalem emehiela nke ukwu,
nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ.
Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya,
nʼihi na ha ahụla ọtọ ya.
Ya onwe ya kwa na-asụ ude,
ma chigharịakwa azụ. 9Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya.
Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu.
Lee ka o si daa, dasie ike,
ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi.
“Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile.
Lee ka ndị iro si merie m.” 10Onye iro agbasaala aka ya
chịkọtaa akụ ya niile.
O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche
si bata ebe nsọ ya.
Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata
bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị. 11Ndị ya niile na-asụ ude
mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri.
Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri,
ime ka ha nwee ike dịrị ndụ.
“Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile,
nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.” 12“Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe?
Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ.
O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m,
nke e mere ka ọ bịakwasị m,
bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m,
nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.