Native Bible

Lamentations 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ya niile na-asụ ude mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. “Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.”

Lamentations 1:11 in English

Lamentations 1:11 · Berean Standard Bible

All her people groan as they search for bread. They have traded their treasures for food to keep themselves alive. Look, O LORD, and consider, for I have become despised.

Context

9Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.” 10Onye iro agbasaala aka ya chịkọtaa akụ ya niile. O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche si bata ebe nsọ ya. Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị. 11Ndị ya niile na-asụ ude mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. “Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.” 12“Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe? Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ. O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m, nke e mere ka ọ bịakwasị m, bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m, nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ? 13“O si nʼelu zite ọkụ, e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m. Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee, meekwa ka m laghachi azụ. O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu, onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.