Abụ Akwa 1:11
Lamentations 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ya niile na-asụ ude mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. “Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.”
Lamentations 1:11 in English
Lamentations 1:11 · Berean Standard Bible
All her people groan as they search for bread. They have traded their treasures for food to keep themselves alive. Look, O LORD, and consider, for I have become despised.
Context
9Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya.
Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu.
Lee ka o si daa, dasie ike,
ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi.
“Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile.
Lee ka ndị iro si merie m.” 10Onye iro agbasaala aka ya
chịkọtaa akụ ya niile.
O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche
si bata ebe nsọ ya.
Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata
bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị. 11Ndị ya niile na-asụ ude
mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri.
Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri,
ime ka ha nwee ike dịrị ndụ.
“Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile,
nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.” 12“Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe?
Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ.
O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m,
nke e mere ka ọ bịakwasị m,
bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m,
nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ? 13“O si nʼelu zite ọkụ,
e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m.
Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee,
meekwa ka m laghachi azụ.
O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.