Abụ Akwa 1:13
Lamentations 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“O si nʼelu zite ọkụ, e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m. Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee, meekwa ka m laghachi azụ. O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu, onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.
Lamentations 1:13 in English
Lamentations 1:13 · Berean Standard Bible
He sent fire from on high, and it overpowered my bones. He spread a net for my feet and turned me back. He made me desolate, faint all the day long.
Context
11Ndị ya niile na-asụ ude
mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri.
Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri,
ime ka ha nwee ike dịrị ndụ.
“Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile,
nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.” 12“Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe?
Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ.
O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m,
nke e mere ka ọ bịakwasị m,
bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m,
nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ? 13“O si nʼelu zite ọkụ,
e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m.
Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee,
meekwa ka m laghachi azụ.
O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile. 14“Ọ na-eleru anya na mmehie m niile;*
jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ.
A nyakwasịla ya nʼolu m.
Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m.
O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ
m na-apụghị iguzogide. 15“Onyenwe anyị ajụla
ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m.
Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m,
ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile.
Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya
ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.