Abụ Akwa 1:14
Lamentations 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ na-eleru anya na mmehie m niile;* jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. A nyakwasịla ya nʼolu m. Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ m na-apụghị iguzogide.
Lamentations 1:14 in English
Lamentations 1:14 · Berean Standard Bible
My transgressions are bound into a yoke,* knit together by His hand; they are draped over my neck, and the Lord has broken my strength. He has delivered me into the hands of those I cannot withstand.
Context
12“Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe?
Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ.
O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m,
nke e mere ka ọ bịakwasị m,
bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m,
nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ? 13“O si nʼelu zite ọkụ,
e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m.
Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee,
meekwa ka m laghachi azụ.
O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile. 14“Ọ na-eleru anya na mmehie m niile;*
jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ.
A nyakwasịla ya nʼolu m.
Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m.
O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ
m na-apụghị iguzogide. 15“Onyenwe anyị ajụla
ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m.
Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m,
ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile.
Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya
ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke. 16“Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa.
Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya.
O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso;
o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m.
Ụmụ m atọgbọla nʼefu,
nʼihi na onye iro emeriela.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.