Abụ Akwa 1:8
Lamentations 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jerusalem emehiela nke ukwu, nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. Ya onwe ya kwa na-asụ ude, ma chigharịakwa azụ.
Lamentations 1:8 in English
Lamentations 1:8 · Berean Standard Bible
Jerusalem has sinned greatly; therefore she has become an object of scorn. All who honored her now despise her, for they have seen her nakedness;* she herself groans and turns away.
Context
6Ịma mma niile
esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ.
Ụmụ eze ya dị ka ele
nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri.
Nʼihi adịghị ike ha,
ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga. 7Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala,
Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie.
Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị.
Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya,
o nweghị onye inyeaka ha hụrụ.
Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ
ya, chịa ya ọchị. 8Jerusalem emehiela nke ukwu,
nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ.
Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya,
nʼihi na ha ahụla ọtọ ya.
Ya onwe ya kwa na-asụ ude,
ma chigharịakwa azụ. 9Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya.
Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu.
Lee ka o si daa, dasie ike,
ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi.
“Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile.
Lee ka ndị iro si merie m.” 10Onye iro agbasaala aka ya
chịkọtaa akụ ya niile.
O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche
si bata ebe nsọ ya.
Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata
bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.