Abụ Akwa 1:6
Lamentations 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.
Lamentations 1:6 in English
Lamentations 1:6 · Berean Standard Bible
All the splendor has departed from the Daughter of Zion. Her princes are like deer that find no pasture; they lack the strength to flee in the face of the hunter.
Context
4Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ,
nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka.
Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu,
ndị nchụaja ya na-asụ ude,
ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute,
ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu. 5Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya;
ndị iro ya nọ nʼahụ udo.
Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ,
nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile.
E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ,
dịka ndị a dọtara nʼagha. 6Ịma mma niile
esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ.
Ụmụ eze ya dị ka ele
nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri.
Nʼihi adịghị ike ha,
ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga. 7Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala,
Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie.
Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị.
Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya,
o nweghị onye inyeaka ha hụrụ.
Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ
ya, chịa ya ọchị. 8Jerusalem emehiela nke ukwu,
nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ.
Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya,
nʼihi na ha ahụla ọtọ ya.
Ya onwe ya kwa na-asụ ude,
ma chigharịakwa azụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.