Abụ Akwa 1:4
Lamentations 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ, nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka. Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu, ndị nchụaja ya na-asụ ude, ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute, ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.
Lamentations 1:4 in English
Lamentations 1:4 · Berean Standard Bible
The roads to Zion mourn, because no one comes to her appointed feasts. All her gates are deserted; her priests groan, her maidens grieve, and she herself is bitter with anguish.
Context
2Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị,
anya mmiri na-asọdakwa na nti ya,
nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya,
ọ dịghị onye na-akasị ya obi.
Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya;
ha niile aghọọla ndị iro ya. 3Juda ejeela biri nʼala ọzọ,
mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta.
Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche,
ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla.
Nʼetiti nhụju anya ya
ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya. 4Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ,
nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka.
Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu,
ndị nchụaja ya na-asụ ude,
ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute,
ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu. 5Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya;
ndị iro ya nọ nʼahụ udo.
Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ,
nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile.
E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ,
dịka ndị a dọtara nʼagha. 6Ịma mma niile
esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ.
Ụmụ eze ya dị ka ele
nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri.
Nʼihi adịghị ike ha,
ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.