Abụ Akwa 1:5
Lamentations 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya; ndị iro ya nọ nʼahụ udo. Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ, nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile. E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.
Lamentations 1:5 in English
Lamentations 1:5 · Berean Standard Bible
Her foes have become her masters; her enemies are at ease. For the LORD has brought her grief because of her many transgressions. Her children have gone away as captives before the enemy.
Context
3Juda ejeela biri nʼala ọzọ,
mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta.
Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche,
ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla.
Nʼetiti nhụju anya ya
ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya. 4Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ,
nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka.
Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu,
ndị nchụaja ya na-asụ ude,
ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute,
ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu. 5Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya;
ndị iro ya nọ nʼahụ udo.
Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ,
nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile.
E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ,
dịka ndị a dọtara nʼagha. 6Ịma mma niile
esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ.
Ụmụ eze ya dị ka ele
nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri.
Nʼihi adịghị ike ha,
ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga. 7Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala,
Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie.
Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị.
Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya,
o nweghị onye inyeaka ha hụrụ.
Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ
ya, chịa ya ọchị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.