Abụ Akwa 1:2
Lamentations 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.
Lamentations 1:2 in English
Lamentations 1:2 · Berean Standard Bible
She weeps aloud in the night, with tears upon her cheeks. Among all her lovers there is no one to comfort her. All her friends have betrayed her; they have become her enemies.
Context
1Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ
si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu!
Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ,
bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile.
Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị
si ghọọ ohu. 2Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị,
anya mmiri na-asọdakwa na nti ya,
nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya,
ọ dịghị onye na-akasị ya obi.
Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya;
ha niile aghọọla ndị iro ya. 3Juda ejeela biri nʼala ọzọ,
mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta.
Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche,
ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla.
Nʼetiti nhụju anya ya
ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya. 4Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ,
nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka.
Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu,
ndị nchụaja ya na-asụ ude,
ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute,
ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.