Jeremaya 50:39
Jeremiah 50:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Jeremiah 50:39 in English
Jeremiah 50:39 · Berean Standard Bible
So the desert creatures and hyenas will live there and ostriches * will dwell there. It will never again be inhabited or lived in from generation to generation.
Context
37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha,
na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha.
Ha ga-aghọkwa ndị inyom.
Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile.
A ga-alụta ha niile nʼagha. 38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile
mee ka ha taa.
Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị:
arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha. 39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ.
Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ.
Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ.
O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze
ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.