Native Bible

Jeremiah 50:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Jeremiah 50:39 in English

Jeremiah 50:39 · Berean Standard Bible

So the desert creatures and hyenas will live there and ostriches * will dwell there. It will never again be inhabited or lived in from generation to generation.

Context

37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha. 38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha. 39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.