Jeremaya 50:41
Jeremiah 50:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
Jeremiah 50:41 in English
Jeremiah 50:41 · Berean Standard Bible
Behold, an army is coming from the north; a great nation and many kings are stirred up from the ends of the earth.
Context
39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ.
Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ.
Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ.
O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze
ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa. 42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe;
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Babilọn. 43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,
akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu ejidela ya,
ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.