Jeremaya 50:43
Jeremiah 50:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha, akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu ejidela ya, ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme.
Jeremiah 50:43 in English
Jeremiah 50:43 · Berean Standard Bible
The king of Babylon has heard the report, and his hands hang limp. Anguish has gripped him, pain like that of a woman in labor.
Context
41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze
ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa. 42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe;
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Babilọn. 43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,
akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu ejidela ya,
ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme. 44Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ,
nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” 45Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn,
nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ.
Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.