Jeremaya 50:45
Jeremiah 50:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn, nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ. Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
Jeremiah 50:45 in English
Jeremiah 50:45 · Berean Standard Bible
Therefore hear the plans that the LORD has drawn up against Babylon and the strategies He has devised against the land of the Chaldeans: Surely the little ones of the flock will be dragged away; certainly their pasture will be made desolate because of them.
Context
43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,
akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu ejidela ya,
ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme. 44Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ,
nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” 45Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn,
nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ.
Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a. 46Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn,
iti mkpu akwa ya ga-adakwa ụda nʼetiti mba niile dị iche iche.
50:5 Rapara nʼahụ Onyenwe anyị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.