Jeremaya 50:44
Jeremiah 50:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ, nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
Jeremiah 50:44 in English
Jeremiah 50:44 · Berean Standard Bible
Behold, one will come up like a lion from the thickets of the Jordan to the watered pasture. For in an instant I will chase Babylon from her land. Who is the chosen one I will appoint for this? For who is like Me, and who can challenge Me? What shepherd can stand against Me?”
Context
42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe;
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Babilọn. 43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,
akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu ejidela ya,
ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme. 44Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ,
nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” 45Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn,
nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ.
Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a. 46Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn,
iti mkpu akwa ya ga-adakwa ụda nʼetiti mba niile dị iche iche.
50:5 Rapara nʼahụ Onyenwe anyị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.