Jeremaya 50:42
Jeremiah 50:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.
Jeremiah 50:42 in English
Jeremiah 50:42 · Berean Standard Bible
They grasp the bow and spear;* they are cruel and merciless. Their voice roars like the sea, and they ride upon horses, lined up like men in formation against you, O Daughter of Babylon.
Context
40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze
ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa. 42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe;
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Babilọn. 43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,
akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu ejidela ya,
ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme. 44Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ,
nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.