Native Bible

Jeremiah 50:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”

Jeremiah 50:40 in English

Jeremiah 50:40 · Berean Standard Bible

As God overthrew Sodom and Gomorrah along with their neighbors,” declares the LORD, “no one will dwell there; no man will abide there.

Context

38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha. 39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa. 42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.