Jeremaya 50:38
Jeremiah 50:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha.
Jeremiah 50:38 in English
Jeremiah 50:38 · Berean Standard Bible
A drought is upon her waters, and they will be dried up. For it is a land of graven images, and the people go mad over idols.*
Context
36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile.
Ha ga-aghọ ndị nzuzu.
Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha.
Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu. 37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha,
na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha.
Ha ga-aghọkwa ndị inyom.
Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile.
A ga-alụta ha niile nʼagha. 38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile
mee ka ha taa.
Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị:
arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha. 39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ.
Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ.
Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ.
O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.