Native Bible

Jeremiah 50:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu.

Jeremiah 50:36 in English

Jeremiah 50:36 · Berean Standard Bible

A sword is against her false prophets, and they will become fools. A sword is against her warriors, and they will be filled with terror.

Context

34Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike. 35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe. 36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu. 37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha. 38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.