Native Bible

Jeremiah 50:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike.

Jeremiah 50:34 in English

Jeremiah 50:34 · Berean Standard Bible

Their Redeemer is strong; the LORD of Hosts is His name. He will fervently plead their case so that He may bring rest to the earth, but turmoil to those who live in Babylon.

Context

32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa, ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa. Aga m esunye obodo ya niile ọkụ, nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.” 33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “A na-emegbu nnọọ ndị Izrel, nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda. Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike. Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa. 34Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike. 35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe. 36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.