Jeremaya 50:33
Jeremiah 50:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “A na-emegbu nnọọ ndị Izrel, nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda. Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike. Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa.
Jeremiah 50:33 in English
Jeremiah 50:33 · Berean Standard Bible
This is what the LORD of Hosts says: “The sons of Israel are oppressed, and the sons of Judah as well. All their captors hold them fast, refusing to release them.
Context
31“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
“Nʼihi na ụbọchị gị abịala,
bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ. 32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa,
ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa.
Aga m esunye obodo ya niile ọkụ,
nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.” 33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:
“A na-emegbu nnọọ ndị Izrel,
nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda.
Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike.
Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa. 34Ma Onye mgbapụta ha dị ike.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya.
Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha,
ime ka ala ha nweekwa izuike,
ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike. 35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“na ndị ahụ niile bi na Babilọn
ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.